Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 7:22-33 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.

23. Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu.

24. Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ.

25. Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.

26. Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.

27. Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.

28. Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.

29. Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a;

30. ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;

31. ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.

32. Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ:

33. ma onye nwere nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe uwa, otú ọ gēme ihe gātọ nwunye-ya utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 7