Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 4:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya.

7. N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?

8. Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze.

9. N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.

10. Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.

11. We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi;

12. ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:

13. mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n'uwa, ihe ehichapuru n'ihe nile, rue ub͕u a.

14. Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya.

15. N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu.

16. Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 4