Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 3:20-23 Bible Nso (IGBOB)

20. ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu.

21. Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu;

22. ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu;

23. ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 3