Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 2:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.

2. N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe.

3. Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji.

4. Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5. ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.

6. Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:

7. kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

8. nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:

9. kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,Nke nābàghi kwa n'obi madu,Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 2