Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 2:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.

2. N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe.

3. Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji.

4. Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5. ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.

6. Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:

7. kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

8. nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:

9. kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,Nke nābàghi kwa n'obi madu,Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.

10. Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 2