Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 15:48-52 Bible Nso (IGBOB)

48. Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.

49. Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu.

50. Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.

51. Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,

52. n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 15