Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 15:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;

4. na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;

5. na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya;

6. emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n'etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n'otù mb͕e, ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n'ura ọnwu;

7. emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya;

8. ma n'ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya.

9. N'ihi na mu onwem dikarisiri ntà n'etiti ndi-ozi, ebe m'nērughi ka akpọm onye-ozi, n'ihi na esob͕urum nzukọ Chineke.

10. Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

11. Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra.

12. Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n'etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi?

13. Ma ọ buru na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie:

14. ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.

15. Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n'ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n'ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n'ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie.

16. N'ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 15