Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 14:33-40 Bible Nso (IGBOB)

33. n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.

34. Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.

35. Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.

36. Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n'ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu?

37. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu.

38. Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama.

39. Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu.

40. Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 14