Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 13:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.

9. N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:

10. ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.

11. Mb͕e m'buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n'ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m'ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè.

12. N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.

13. Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 13