Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 12:7-27 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma anēnye madu nile n'otù n'otù n'etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù.

8. N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:

9. nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka;

10. nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:

11. ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.

12. N'ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n'aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa.

13. N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.

14. N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe.

15. Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka.

16. Ọ buru kwa na nti gāsi, N'ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka.

17. Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di?

18. Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.

19. Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di?

20. Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru.

21. Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm.

22. Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku:

23. akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n'anya bu nke mabigara ókè kari;

24. ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;

25. ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu.

26. Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.

27. Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 12