Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 12:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.

19. Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di?

20. Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru.

21. Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm.

22. Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku:

23. akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n'anya bu nke mabigara ókè kari;

24. ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;

25. ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu.

26. Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.

27. Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.

28. Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.

29. Ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozi? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-amuma? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozizí? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi nālu ọlu di ike?

30. ọ̀ gābu na ha nile nwere onyinye-amara ime ka madu di ike? ọ̀ gābu na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu? ọ̀ gābu na ha nile nāsughari asusu?

31. Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 12