Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 11:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke:

10. n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi.

11. Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi.

12. N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.

13. Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n'isi?

14. Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?

15. Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n'ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n'ọnọdu ihe ib͕okwasi n'aru.

16. Ma ọ buru na unu nēchè na onye ọ bula bu onye nēse okwu, ayi onwe-ayi, ma-ọbu nzukọ Chineke, enweghi ọme-n'ala di otú a.

17. Ma n'inye unu iwu a, etoghm unu, na unu adighi-abiakọ n'otù ebe ka unu we dikari nma, kama ka unu we jọkari njọ.

18. N'ihi na ihe mbu, mb͕e unu biakọrọ na nzukọ, anurum na nkewa di iche iche nādi n'etiti unu; ekwe-kwa-ram ya ufọdu.

19. N'ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n'etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n'etiti unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 11