Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 11:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ya mere mb͕e unu biakọrọ n'otù ebe, ọ bughi iri nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi:

21. n'ihi na madu nile n'otù n'otù, mb͕e unu nēri, nēburu ndi ọzọ uzọ rie nri-anyasi nke aka ha; agu we nāgu otù onye, onye ọzọ nāṅubiga kwa manya ókè.

22. Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m'gāsi unu? #m'gēto unu? Etoghi m unu na nka.

23. N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,

24. kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.

25. Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.

26. N'ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 11