Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 10:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.

8. Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri.

9. Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì.

10. Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì.

11. Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.

12. Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.

13. Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

14. N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi.

15. Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 10