Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 10:24-33 Bible Nso (IGBOB)

24. Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.

25. Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche;

26. n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.

27. Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche.

28. Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche:

29. akọ-na-uche, ka m'kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n'ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé?

30. Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n'ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele?

31. Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

32. Unu aghọla ndi nēme ndi-Ju, ma-ọbu ndi-Grik, ma-ọbu nzukọ Chineke, ka ha su ngọngọ:

33. dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 10