Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 1:20-31 Bible Nso (IGBOB)

20. Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?

21. N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.

22. Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe:

23. ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;

24. ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke.

25. N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike.

26. N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ:

27. Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;

28. ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè:

29. ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke.

30. Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:

31. ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 1