Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 1:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl?

14. Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs;

15. ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem.

16. Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism.

17. N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.

18. N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.

19. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì,M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta.

20. Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?

21. N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.

22. Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe:

23. ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 1