Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Jọn 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya.

2. Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.

3. Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n'ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.

4. Onye ọ bula nke nēme nmehie, ọ nēme kwa ihe nmebi iwu: nmehie bu kwa nmehie-iwu.

5. Unu mata-kwa-ra na emere ka Ya onwe-ya puta ìhè ka O we hichapu nmehie; nmehie adighi kwa nime Ya.

6. Onye ọ bula nke nānọgide nime Ya adighi-emehie: onye ọ bula nke nēmehie ahughi Ya anya mb͕e ọ bula, ọ maghi kwa Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Jọn 3