Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 9:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di:

2. na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n'ihi na ọ mara ihe nke-uku.

3. Taia we wuere onwe-ya ebe ewusiri ike, tukọba ọla-ọcha dika ájá, na ọla-edo ọma dika apiti nke amá.

4. Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n'oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 9