Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 7:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-anọ nke Daraiọs, bú eze, na okwu Jehova ruru Zekaraia nti, n'ubọchi nke-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'ọnwa Kislev.

2. Ma ndi Bet-el zigarari Shareza na Regem-melek na ndi-ha ime ka iru Jehova dajua,

3. na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?

4. Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

5. Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?

6. Ọzọ, mb͕e unu nēri ihe, ma-ọbu mb͕e unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bughi unu onwe-unu bu ndi nēri ihe? ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu bu ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu?

7. Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?

8. Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si,

9. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:

10. unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 7