Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, akwukwọ-npiakọta nke nēfe efe.

2. O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we za, Mu onwem nāhu akwukwọ-npiakọta nēfe efe; ogologo-ya di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri.

3. O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di.

4. Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.

5. Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we puta, sim, Biko, welie anya-gi abua, hu ihe ọ bu, bú ihe a nke nāpu apu.

6. M'we si, Gini ka ọ bu? Ọ si, Nka bu ihe-ọtùtù ephah nke nāpu apu. O we si, Nka bu oyiyi-ha n'ala nka nile:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 5