Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 4:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n'ura-ya.

2. O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya:

3. osisi olive abua di kwa n'akuku ya, otù n'aka-nri ọkwa ahu, na otù n'aka-ekpe-ya.

4. M'we za, gwa mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, si, Ndia bu gini, onye-nwem?

5. Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we za, sim, Ì maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem.

6. O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.

7. Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 4