Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 4:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n'ura-ya.

2. O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya:

3. osisi olive abua di kwa n'akuku ya, otù n'aka-nri ọkwa ahu, na otù n'aka-ekpe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 4