Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 2:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. Éwù, gi Zaion, wepuga onwe-gi, gi nwanyi nke gi na ada Babilon nēbi.

8. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.

9. N'ihi na, le, M'gaje ifeghari akam n'aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom.

10. Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n'ihi na, le, Mu nābia, M'gēbi kwa n'etiti gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

11. Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.

12. Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.

13. Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 2