Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 11:5-12 Bible Nso (IGBOB)

5. nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha.

6. N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.

7. M'we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n'ezie ọ bu ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M'we chiri n'onwem nkpa-n'aka abua; otù ka m'kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m'kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m'we zùa ìgwè ewu na aturu.

8. M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.

9. M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.

10. M'we were nkpa-n'akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara.

11. Ewe nyajie ya n'ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu.

12. M'we si ha, Ọ buru na ọ di nma n'anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 11