Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 11:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u;

5. nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha.

6. N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.

7. M'we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n'ezie ọ bu ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M'we chiri n'onwem nkpa-n'aka abua; otù ka m'kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m'kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m'we zùa ìgwè ewu na aturu.

8. M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.

9. M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.

10. M'we were nkpa-n'akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara.

11. Ewe nyajie ya n'ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu.

12. M'we si ha, Ọ buru na ọ di nma n'anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri.

13. Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M'we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n'ulo Jehova.

14. M'we b͕ujira nkpa-n'akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu.

15. Jehova we sim, Were kwa n'onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya.

16. N'ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n'ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 11