Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zefanaia 3:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehova bu onye ezi omume n'etiti ya; Ọ dighi-eme ajọ omume; kwa-ututu ka Ọ nēme ka ikpé-Ya puta ìhè, ọ dighi mb͕e Ọ nādighi; ma onye ajọ omume adighi-ama ihere.

6. Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n'efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi.

7. Asirim, N'ezie i gātu egwum, i gānara idọ-aka-na-nti; ewe ghara ibipu ebe-obibi-ya, dika ihe nile si di nke M'jiworo leta ya: ma otú ọ di, ha biliri n'isi-ututu, bibie omume nile ha.

8. N'ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M'gēbili ọtọ ikwata ihe: n'ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M'we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n'ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile.

9. N'ihi na mb͕e ahu ka M'gāb͕anwere ndi nile di iche iche eb͕ub͕ere-ọnu di ọcha, ka ha nile we kpọkue aha Jehova, ifè Ya n'otù ùbú.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zefanaia 3