Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Rut 4:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. _Ozọ kwa, Rut, b/u nwayi Moab, b/u nwunye Mahlon, ka m>zuruwo-kwa-ra ibu nwunyem, ime ka aha onye nwuru anwu bilie n>elu ihe-nketa-ya, ka aghara kwa ibipu aha onye nwuru anwu n>etiti umu-nne-ya, na n>ọnu-uzọ-ama ebe nke ya: ndi-#am#a ka unu bu ta.

11. Ndi nile ndi nọ n>ọnu-uzọ-ama na ndi-okenye we si, Ndi-#am#a ka ayi bu. Jehova me nwayi a nke n=ab#a n>ulo-gi ka ọ di ka Rechel na dika Lea, ndi ha abua wuru ulo Israel: gi me kwa d#inkp#a n>Efrata, me ka amara aha-gi na Bet-lehem:

12. ka ulo-gi di kwa ka ulo Perez, onye Tema muru nye Juda, site na nkpuru nke Jehova g=enye gi site na nwa-ab͕ọghọ a.

13. Boaz we kuru Rut, o we ghọrọ ya nwunye; o we bakuru ya, Jehova we me ka ọ turu ime, ọ mua nwa-nwoke.

14. Ndinyom we si Naomi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye n=emeghi ka onye-nb͕aputa kwusiri gi ta, ka akpọ kwa aha-ya n>Israel.

15. _O g=abu-kwa-ra gi onye n=enyeghachi ndu, na onye g=az#u gi n>isi-awọ: n>ihi na nwunye nwa-gi, nke huru gi n>anya, nke diri gi nma kari umu-ndikom asa, amuwo ya.

16. Naomi we kuru nwata ahu, tukwasi ya n>obi-ya, ghọrọ ya onye n=az#u nwa.

17. Ndinyom, b/u ndi-ab͕ata-obi-ya, we kpọ ya aha, si, Amuru nwa-nwoke nye Naomi; ha we kpọ aha-ya Obed: onye ahu bu nna Jesi, nna Devid.

18. Ma ndia bu osuso-ọmumu Perez: Perez muru Hezron;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Rut 4