Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Rut 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n>ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n>ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua.

2. Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu.

3. Elimelek, b/u di Naomi, we nwua; ma nwayi ahu na umu-ya ndikom abua fọduru.

4. Ha we lutara onwe-ha nwunye sitere n>umu-ndinyom Moab; aha ot#u bu _Opa, aha nke-ọzọ bu Rut: ha we biri n>ebe ahu ihe ra ka arọ iri.

5. Mahlon na Kilion we nwu kwa, ha abua; o we fọdu n/an/i nwayi ahu site n>umu-ya abua site kwa na di-ya.

6. O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n>ala-ọhia Moab lata: n>ihi na ọ nuru n>ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n>inye ha nri.

7. O we si n>ebe ọ nọ pua, ya na nwunye abua nke umu-ya; ha we je n>uzọ ilata n>ala Juda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Rut 1