Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 6:18-29 Bible Nso (IGBOB)

18. Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ.

19. Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di.

20. Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.

21. Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri.

22. Umu-ndikom Uziel kwa; Mishael, na Elzafan, na Sitri.

23. Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

24. Umu-ndikom Kora kwa; Asia, na Elkena, na Abiasaf; ndia bu ab͕uru ndi Kora.

25. Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di.

26. Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.

27. Ha onwe-ha bu ndi nāgwa Fero eze Ijipt okwu, ime ka umu Israel si n'Ijipt pua: ndia bu Moses na Eron ahu.

28. O rue, n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ala Ijipt,

29. na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 6