Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 6:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya.

2. Chineke we gwa Moses okwu, si ya, Mu onwem bu JEHOVA:

3. eme-kwa-ram Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob, ka ha hum anya dika Chineke Nke puru ime ihe nile, ma n'aham, bú JEHOVA, ka anēmeghi ka ha maram.

4. Ọzọ kwa, emewom ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe ha nọ, inye ha ala Kenean, bú ala ọnọdu-ọbìa nile ha, nke ha nọri dika ọbìa nime ya.

5. Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum.

6. N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu:

7. M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 6