Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 5:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Ka òfùfè-ha di arọ́ n'aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma.

10. Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka.

11. Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu.

12. Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka.

13. Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 5