Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 5:6-15 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike na ndi nēle ha anya n'ọlu iwu, si,

7. Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka.

8. Ọnu-ọgugu brick, nke ha onwe-ha nākpu na mb͕e gara aga, ka unu gātukwasi ha; unu agubìla ihe nime ya: n'ihi na ndi-ume-ngwu ka ha bu; n'ihi ya ka ha onwe-ha nēti nkpu, si, Ka ayi je, chuara Chineke-ayi àjà.

9. Ka òfùfè-ha di arọ́ n'aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma.

10. Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka.

11. Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu.

12. Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka.

13. Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di.

14. Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n'ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n'ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n'ikpu brick dika na mb͕e gara aga?

15. Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we bia tikue Fero, si, N'ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 5