Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 5:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo.

17. Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n'ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà.

18. Ma ub͕u a, jenu, fè òfùfè; n'ihi na agaghi-enye unu okporo-ọka, ma ọnu-ọgugu brick-unu ka unu gēnye.

19. Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we hu ha na ha nọ n'ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya.

20. Ha we zute Moses na Eron, ndi nēguzo onwe-ha izute ha, mb͕e ha si n'ebe Fero nọ puta:

21. ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.

22. Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n'ihi gini bu nka na I zitewom?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 5