Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 40:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. I gētiye kwa ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru ib͕e ihe-àmà ahu, tukwasi kwa ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu.

6. I gētiye kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu n'iru ọnu-uzọ nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu.

7. I gētiye kwa ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye miri n'ebe ahu.

8. I gēdebe kwa ogige ahu buruburu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu.

9. I gēwere kwa manu otite-manu ahu te ebe-obibi ahu, na ihe nile nke di nime ya, i gēdo kwa ya nsọ, na ihe-ya nile: ọ gādi kwa nsọ.

10. I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 40