Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 4:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo.

20. Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya.

21. Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.

22. I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu:

23. M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.

24. O rue, n'uzọ n'ebe inọ ọnọdu-abali, na Jehova zutere ya, chọ ime ka ọ nwua.

25. Zipora we were ọ́mú, bipu api nwa-ya, me ka ọ metu ukwu abua nke di-ya; Zipora we si, N'ezie di nke ọbara ka i bu n'ebe m'nọ.

26. Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù.

27. Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú.

28. Moses we gosi Eron okwu nile nke Jehova, bú nke O zitere ya ka o kwue, na ihe-iriba-ama nile Ọ nyere ya iwu ka ọ me.

29. Moses na Eron we je chikọta ndi-okenye nile nke umu Israel:

30. Eron we kwue okwu nile nke Jehova gwara Moses, ọ me kwa ihe-iriba-ama nile n'anya ndi Israel.

31. Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 4