Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 39:35-42 Bible Nso (IGBOB)

35. na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu;

36. na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke;

37. na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n'usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè;

38. na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu;

39. na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;

40. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu;

41. na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.

42. Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 39