19. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.
20. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.
21. Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22. Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;
23. ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.
24. Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.