Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 38:23-31 Bible Nso (IGBOB)

23. Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.

24. Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n'ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di.

25. Ọla-ọcha nke ndi agukọtara agukọta n'etiti nzukọ Israel di ọgu talent ise, na nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di:

26. otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

27. Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu.

28. Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide.

29. Ọla nke àjà-ofufé ahu di kwa ọgu talent atọ na iri, na nnù shekel isi.

30. O ji ya me ukwu nile nke ide ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, na ebe-ichu-àjà ọla, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu,

31. na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 38