Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 37:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka o mere cherubim ahu, na nsọtu-ya abua.

9. Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di.

10. O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di:

11. ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

12. O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

13. Ọ wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tukwasi nb͕a-aka ahu na nkuku anọ nke di n'ukwu anọ ya.

14. Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka di, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu.

15. O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo, iji ebu table ahu.

16. O me-kwa-ra ihe nile nke di n'elu table, bú afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka ha bu.

17. O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya:

18. alaka isi nēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

19. iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 37