Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 37:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.

24. Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile.

25. O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya.

26. Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu.

27. Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, n'elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya.

28. O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo.

29. O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 37