Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 37:2-12 Bible Nso (IGBOB)

2. ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka ọ machitara ya, o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu

3. O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.

4. O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.

5. O we me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iji ebu ib͕e ahu.

6. O me-kwa-ra ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di.

7. O me-kwa-ra cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka o mere ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie;

8. otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka o mere cherubim ahu, na nsọtu-ya abua.

9. Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di.

10. O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di:

11. ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

12. O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 37