Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 37:17-28 Bible Nso (IGBOB)

17. O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya:

18. alaka isi nēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

19. iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa.

20. iko anọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:

21. otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi nime ya waputa.

22. Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

23. O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.

24. Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile.

25. O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya.

26. Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu.

27. Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, n'elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya.

28. O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 37