Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 37:17-19 Bible Nso (IGBOB)

17. O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya:

18. alaka isi nēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

19. iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 37