Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 36:28-38 Bible Nso (IGBOB)

28. Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.

29. Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu.

30. Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

31. O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,

32. nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo nke ebe-obibi ahu, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.

33. O we me ka nkpọrọ etiti gabiga n'etiti ibo ahu, si n'otù nsọtu rue nsọtu ọzọ.

34. Ọ machita-kwa-ra ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu, ọ machita-kwa-ra nkpọrọ ahu ọla-edo.

35. O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim.

36. O we mere ya ide acacia anọ, machita ha ọla-edo: nkpọye-ha bu ọla-edo; o we wuara ha ukwu ọla-edo anọ.

37. O we mere ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwà-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọ bu ọlu onye-ọdudu-ákwà;

38. o me-kwa-ra ide ise ya na nkpọye-ha, machita isi-ha na ngegide-ha ọla-edo: ma ukwu ise ha bu ọla.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 36