Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 35:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Moses we kpọkọta nzukọ nile nke umu Israel, si ha, Ndia bu okwu nke Jehova nyeworo n'iwu, ka unu me ha.

2. Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n'ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua.

3. Unu afunwula ọku n'ebe-obibi-unu nile n'ubọchi-izu-ike.

4. Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, si,

5. Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

6. na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

7. na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

8. na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me;

9. na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.

10. Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;

11. ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile,

12. na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 35