Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 32:18-30 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ si, Ọ bughi olu ndi nāza n'idi-ike, ọ bughi kwa olu ndi nāza n'adighi-ike; olu ndi nāza n'ibù abù ka mu onwem nānu.

19. O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu.

20. O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.

21. Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?

22. Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ.

23. Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.

24. M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta.

25. Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha:

26. Moses we guzo n'ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ.

27. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.

28. Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n'etiti ndi Israel da n'ubọchi ahu.

29. Moses we si, Mejuenu aka-unu ta nye Jehova, n'ihi na nwoke ọ bula nēmegide nwa-ya nwoke, nēmegide kwa nwa-nne-ya nwoke; ka Ọ we nye unu ngọzi ta.

30. O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 32