1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda:
3. emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,
4. icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,