Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 30:25-37 Bible Nso (IGBOB)

25. i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.

26. I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu,

27. na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

28. na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya.

29. I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.

30. Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.

31. I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile.

32. Ọ bughi n'anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu.

33. Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.

34. Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù;

35. i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ:

36. i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n'iru ihe-àmà ahu n'ulo-ikwū nzute, ebe M'gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu.

37. Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n'ebe Jehova nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 30