Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 30:17-30 Bible Nso (IGBOB)

17. Jehova we gwa Moses okwu, si,

18. I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu.

19. Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya:

20. mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ:

21. ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.

22. Jehova we gwa Moses okwu, si,

23. Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri,

24. na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin:

25. i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.

26. I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu,

27. na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

28. na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya.

29. I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.

30. Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 30